Jọn 19:22
John 19:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
John 19:22 in English
John 19:22 · Berean Standard Bible
Pilate answered, “What I have written, I have written.”
Context
20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. 21Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.” 22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.” 23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya. 24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.”
Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ,
“Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha,
feekwa nza banyere uwe mwụda m.”*
Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.