Native Bible

John 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.)

John 18:5 in English

John 18:5 · Berean Standard Bible

“Jesus of Nazareth,” they answered. Jesus said, “I am He.” And Judas His betrayer was standing there with them.

Context

3Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha. 4Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?” 5Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.) 6Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala. 7Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.