Jọn 18:24
John 18:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
John 18:24 in English
John 18:24 · Berean Standard Bible
Then Annas sent Him, still bound, to Caiaphas the high priest.
Context
22Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?” 23Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.” 24Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja. 25Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?”
Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.” 26Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.