Native Bible

John 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m;

John 16:9 in English

John 16:9 · Berean Standard Bible

in regard to sin, because they do not believe in Me;

Context

7Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. 8Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, 9maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; 10ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, 11maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.