Native Bible

John 16:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.”

John 16:18 in English

John 16:18 · Berean Standard Bible

They kept asking, “Why is He saying, ‘a little while’? We do not understand what He is saying.”

Context

16“Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.” 17Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru Nna’?” 18Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.” 19Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’? 20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.