Jọn 15:26
John 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe Onye Ndụmọdụ* ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.
John 15:26 in English
John 15:26 · Berean Standard Bible
When the Advocate * comes, whom I will send to you from the Father—the Spirit of truth who proceeds from the Father—He will testify about Me.
Context
24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’* 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ* ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
15:20 Jọn 13:16
15:25 Abụ 35:19; 69:4
15:26 Onye inyeaka maọbụ onye nkasiobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.