Native Bible

John 13:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.”

John 13:27 in English

John 13:27 · Berean Standard Bible

And when Judas had taken the morsel, Satan entered into him. Then Jesus said to Judas, “What you are about to do, do quickly.”

Context

25Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?” 26Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt. 27Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.” 28Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a. 29Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.