Jọn 10:19
John 10:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
John 10:19 in English
John 10:19 · Berean Standard Bible
Again there was division among the Jews because of Jesus’ message.
Context
17Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ. 18O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.” 19Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a. 20Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?” 21Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.