Native Bible

Jeremiah 7:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.

Jeremiah 7:30 in English

Jeremiah 7:30 · Berean Standard Bible

For the people of Judah have done evil in My sight, declares the LORD. They have set up their abominations in the house that bears My Name, and so have defiled it.

Context

28Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha. 29“ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị. 30“ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya. 31Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi. 32Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.