Jeremaya 7:29
Jeremiah 7:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị.
Jeremiah 7:29 in English
Jeremiah 7:29 · Berean Standard Bible
Cut off your hair and throw it away. Raise up a lamentation on the barren heights, for the LORD has rejected and forsaken the generation of His wrath.’
Context
27“Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza. 28Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha. 29“ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị. 30“ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya. 31Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.