Jeremaya 52:26
Jeremiah 52:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
Jeremiah 52:26 in English
Jeremiah 52:26 · Berean Standard Bible
Nebuzaradan captain of the guard took them and brought them to the king of Babylon at Riblah.
Context
24Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ. 25O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 26Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 27Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.
Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. 28Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya,
puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.