Jeremaya 52:12
Jeremiah 52:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem.
Jeremiah 52:12 in English
Jeremiah 52:12 · Berean Standard Bible
On the tenth day of the fifth month, in the nineteenth year of Nebuchadnezzar’s reign over Babylon, Nebuzaradan captain of the guard, a servant of the king of Babylon, entered Jerusalem.
Context
10Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile. 11Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya. 12Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem. 13O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ. 14Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.