Jeremaya 42:4
Jeremiah 42:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”
Jeremiah 42:4 in English
Jeremiah 42:4 · Berean Standard Bible
“I have heard you,” replied Jeremiah the prophet. “I will surely pray to the LORD your God as you request, and I will tell you everything that the LORD answers; I will not withhold a word from you.”
Context
2Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole. 3Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.” 4Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.” 5Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. 6Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.