Native Bible

Jeremiah 42:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’

Jeremiah 42:20 in English

Jeremiah 42:20 · Berean Standard Bible

For you have deceived yourselves by sending me to the LORD your God, saying, ‘Pray to the LORD our God on our behalf, and as for all that the LORD our God says, tell it to us and we will do it.’

Context

18Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’ 19“Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị, 20na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’ 21Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru. 22Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.