Native Bible

Jeremiah 42:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,

Jeremiah 42:19 in English

Jeremiah 42:19 · Berean Standard Bible

The LORD has told you, O remnant of Judah, ‘Do not go to Egypt.’ Know for sure that I have warned you today!

Context

17Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’ 18Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’ 19“Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị, 20na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’ 21Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.