Jeremaya 39:16
Jeremiah 39:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.
Jeremiah 39:16 in English
Jeremiah 39:16 · Berean Standard Bible
“Go and tell Ebed-melech the Cushite that this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘I am about to fulfill My words against this city for harm and not for good, and on that day they will be fulfilled before your eyes.
Context
14ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya. 15Ma nʼoge ahụ, Jeremaya nọ dị ka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị sị ya, 16“Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị. 17Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha. 18Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
39:4 Ya bụ ndagwurugwu Jọdan
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.