Jeremaya 38:12
Jeremiah 38:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya.
Jeremiah 38:12 in English
Jeremiah 38:12 · Berean Standard Bible
Ebed-melech the Cushite cried out to Jeremiah, “Put these worn-out rags and clothes under your arms to pad the ropes.” Jeremiah did so,
Context
10Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.” 11Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. 12Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya. 13Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche. 14Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.