Native Bible

Jeremiah 36:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”

Jeremiah 36:19 in English

Jeremiah 36:19 · Berean Standard Bible

Then the officials said to Baruch, “You and Jeremiah must hide yourselves and tell no one where you are.”

Context

17Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?” 18Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.” 19Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.” 20Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile. 21Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.