Jeremaya 35:19
Jeremiah 35:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’ ”
Jeremiah 35:19 in English
Jeremiah 35:19 · Berean Standard Bible
this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: Jonadab son of Rechab will never fail to have a man to stand before Me.’”
Context
17“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ” 18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’ 19Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.