Jeremaya 35:11
Jeremiah 35:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”
Jeremiah 35:11 in English
Jeremiah 35:11 · Berean Standard Bible
So when Nebuchadnezzar king of Babylon marched into the land, we said: ‘Come, let us go into Jerusalem to escape the armies of the Chaldeans * and the Arameans.’ So we have remained in Jerusalem.”
Context
9maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ. 10Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu. 11Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.” 12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya 13Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.