Jeremaya 34:4
Jeremiah 34:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha;
Jeremiah 34:4 in English
Jeremiah 34:4 · Berean Standard Bible
Yet hear the word of the LORD, O Zedekiah king of Judah. This is what the LORD says concerning you: You will not die by the sword;
Context
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ. 3Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn. 4“ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha; 5ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ” 6Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.