Native Bible

Jeremiah 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”

Jeremiah 32:5 in English

Jeremiah 32:5 · Berean Standard Bible

He will take Zedekiah to Babylon, where he will stay until I attend to him, declares the LORD. If you fight against the Chaldeans, you will not succeed.’”

Context

3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha. 4Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn, 5onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ” 6Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 7Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.