Jeremaya 32:4
Jeremiah 32:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,
Jeremiah 32:4 in English
Jeremiah 32:4 · Berean Standard Bible
Zedekiah king of Judah will not escape from the hands of the Chaldeans,* but he will surely be delivered into the hand of the king of Babylon, and will speak with him face to face and see him eye to eye.
Context
2Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda. 3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha. 4Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn, 5onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ” 6Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.