Jeremaya 28:16
Jeremiah 28:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”
Jeremiah 28:16 in English
Jeremiah 28:16 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: ‘I am about to remove you from the face of the earth. You will die this year because you have preached rebellion against the LORD.’”
Context
14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ” 15Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha. 16Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ” 17Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.
28:6 Maọbụ, Ya sikwa otu a dịrị
28:12 Lit. Yoku
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.