Native Bible

Jeremiah 27:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu* gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.

Jeremiah 27:12 in English

Jeremiah 27:12 · Berean Standard Bible

And to Zedekiah king of Judah I spoke the same message: “Put your necks under the yoke of the king of Babylon; serve him and his people, and live!

Context

10Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi. 11Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ” 12Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu* gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ. 13Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn? 14Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.