Native Bible

Jeremiah 26:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.

Jeremiah 26:13 in English

Jeremiah 26:13 · Berean Standard Bible

So now, correct your ways and deeds, and obey the voice of the LORD your God, so that He might relent of the disaster He has pronounced against you.

Context

11Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.” 12Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu. 13Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu. 14Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu. 15Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, Onyenwe anyị zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.