Jeremaya 26:12
Jeremiah 26:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu.
Jeremiah 26:12 in English
Jeremiah 26:12 · Berean Standard Bible
But Jeremiah said to all the officials and all the people, “The LORD sent me to prophesy against this house and against this city all the words that you have heard.
Context
10Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 11Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.” 12Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu. 13Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu. 14Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.