Native Bible

Jeremiah 24:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.

Jeremiah 24:7 in English

Jeremiah 24:7 · Berean Standard Bible

I will give them a heart to know Me, that I am the LORD. They will be My people, and I will be their God, for they will return to Me with all their heart.

Context

5“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma. 6Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha. 7Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m. 8“ ‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt. 9Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.