Jeremaya 23:39
Jeremiah 23:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.
Jeremiah 23:39 in English
Jeremiah 23:39 · Berean Standard Bible
therefore I will surely forget you and will cast you out of My presence, both you and the city that I gave to you and your fathers.
Context
37Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’ 38Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’ 39Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha. 40Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”
23:6 Onyenwe anyị, bụ ezi omume anyị.
23:29 Maọbụ, na-ajụ ajụjụ sị
23:29 Lit. Hama
23:33 Akwụkwọ ụfọdụ na-asị, unu onwe unu bụ isi okwu ya
23:34 Maọbụ, okwu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.