Jeremaya 16:12
Jeremiah 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.
Jeremiah 16:12 in English
Jeremiah 16:12 · Berean Standard Bible
And you have done more evil than your fathers. See how each of you follows the stubbornness of his evil heart instead of obeying Me.
Context
10“Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’ 11Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu. 12Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi. 13Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’ 14“Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ,* ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.