Jeremaya 16:11
Jeremiah 16:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.
Jeremiah 16:11 in English
Jeremiah 16:11 · Berean Standard Bible
Then you are to answer them: ‘It is because your fathers have forsaken Me, declares the LORD, and followed other gods, and served and worshiped them. They abandoned Me and did not keep My instruction.
Context
9Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’ 10“Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide Onyenwe anyị Chineke anyị?’ 11Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu. 12Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi. 13Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.