Native Bible

Jeremiah 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”

Jeremiah 11:7 in English

Jeremiah 11:7 · Berean Standard Bible

For from the time I brought your fathers out of the land of Egypt until today, I strongly warned them again and again,* saying, ‘Obey My voice.’

Context

5‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.” 6Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru. 7Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.” 8Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.