Jeremaya 11:18
Jeremiah 11:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ.
Jeremiah 11:18 in English
Jeremiah 11:18 · Berean Standard Bible
And the LORD informed me, so I knew. Then You showed me their deeds.
Context
16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ,
nke na-amị mkpụrụ mara mma.
Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo
ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ;
alaka gị ga-agbajisikwa. 17Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal. 18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. 19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị,
“Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya.
Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya,
ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” 20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya.
Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha,
nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.