Native Bible

Judges 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim* guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.

Judges 9:7 in English

Judges 9:7 · Berean Standard Bible

When this was reported to Jotham, he climbed to the top of Mount Gerizim, raised his voice, and cried out: “Listen to me, O leaders of Shechem, and may God listen to you.

Context

5Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ. 6Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel. 7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim* guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị. 8Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’ 9“Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke* na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.