Ndị Ikpe 9:6
Judges 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
Judges 9:6 in English
Judges 9:6 · Berean Standard Bible
Then all the leaders of Shechem and Beth-millo gathered beside the oak * at the pillar in Shechem and proceeded to make Abimelech their king.
Context
4Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya. 5Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ. 6Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel. 7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim* guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị. 8Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.