Ndị Ikpe 9:53
Judges 9:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.
Judges 9:53 in English
Judges 9:53 · Berean Standard Bible
But a woman dropped an upper millstone on Abimelech’s head, crushing his skull.
Context
51Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ. 52Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ, 53otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya. 54Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara. 55Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.