Ndị Ikpe 9:41
Judges 9:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.
Judges 9:41 in English
Judges 9:41 · Berean Standard Bible
Abimelech stayed in Arumah, and Zebul drove Gaal and his brothers out of Shechem.
Context
39Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ. 40Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ. 41Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem. 42Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a. 43Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.