Native Bible

Judges 9:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.”

Judges 9:38 in English

Judges 9:38 · Berean Standard Bible

“Where is your gloating now?” Zebul replied. “You said, ‘Who is Abimelech that we should serve him?’ Are these not the people you ridiculed? Go out now and fight them!”

Context

36Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.” 37Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.” 38Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.” 39Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ. 40Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.