Native Bible

Judges 9:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.”

Judges 9:36 in English

Judges 9:36 · Berean Standard Bible

When Gaal saw the people, he said to Zebul, “Look, people are coming down from the mountains!” But Zebul replied, “The shadows of the mountains look like men to you.”

Context

34Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ. 35Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta. 36Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.” 37Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.” 38Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.