Ndị Ikpe 9:13
Judges 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
Judges 9:13 in English
Judges 9:13 · Berean Standard Bible
But the grapevine replied, ‘Should I stop giving my wine that cheers both God and man, to hold sway over the trees?’
Context
11“Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 12“Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha. 13“Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 14“Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’ 15“Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.