Native Bible

Judges 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.

Judges 8:13 in English

Judges 8:13 · Berean Standard Bible

After this, Gideon son of Joash returned from the battle along the Ascent of Heres.

Context

11Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha. 12Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile. 13Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ. 14Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ. 15Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.