Ndị Ikpe 8:11
Judges 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.
Judges 8:11 in English
Judges 8:11 · Berean Standard Bible
And Gideon went up by way of the caravan route east of Nobah and Jogbehah, and he attacked their army, taking them by surprise.
Context
9Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.” 10Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ. 11Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha. 12Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile. 13Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.