Native Bible

Judges 6:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa,

Judges 6:36 in English

Judges 6:36 · Berean Standard Bible

Then Gideon said to God, “If You are going to save Israel by my hand, as You have said,

Context

34Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Gidiọn. Ọ fụrụ opi ike nke o ji kpọkọta ndị agha ka ha zukọọ. Ndị agha niile si nʼikwu Abieza pụkwutere ya. 35Otu aka ahụ, o zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru ndị agha ndị Manase, na nke ndị Asha, na nke ndị Zebụlọn, na nke ndị Naftalị, ịkpọ ha ka ha bịa soro ya gaa ibu agha. Ha niile kwenyere pụkwute ya maka agha ahụ. 36Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa, 37lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.” 38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.