Ndị Ikpe 6:30
Judges 6:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”
Judges 6:30 in English
Judges 6:30 · Berean Standard Bible
Then the men of the city said to Joash, “Bring out your son. He must die, because he has torn down Baal’s altar and cut down the Asherah pole beside it.”
Context
28Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ! 29Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?”
Mgbe ha ji nwayọọ jụgharịa ajụjụ, a gwara ha sị, “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ya.” 30Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.” 31Ma Joash tinyere ọnụ jụọ ha ajụjụ sị ha, “Baal, ọ gwara unu na ọ chọrọ ka unu nyere ya aka? Unu na-achọ ịzọpụta ya? Onye ọbụla wepụtara onwe ya maka ịlụrụ Baal ọgụ ga-anwụ tupu chi echi abọọ. Ọ bụrụ nʼezie na Baal bụ chi, hapụnụ ya ka o tigbuo onye ahụ mebiri ebe ịchụ aja ya.” 32Ya mere, nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịkpọ Gidiọn “Jerub-Baal.” Ha kwuru sị, “Ka Baal lụọrọ onwe ya ọgụ,” nʼihi na ọ kwadara ebe ịchụ aja Baal.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.