Native Bible

Judges 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.”

Judges 6:10 in English

Judges 6:10 · Berean Standard Bible

And I said to you: ‘I am the LORD your God. You must not fear * the gods of the Amorites, in whose land you dwell.’ But you did not obey Me.”

Context

8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu. 9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha. 10Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.” 11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. 12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.