Ndị Ikpe 3:19
Judges 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.
Judges 3:19 in English
Judges 3:19 · Berean Standard Bible
But upon reaching the idols near Gilgal, he himself turned back and said, “I have a secret message for you, O king.” “Silence,” said the king, and all his attendants left him.
Context
17O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu. 18Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ. 19Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.”
Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo. 20Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ, 21Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.