Ndị Ikpe 21:8
Judges 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.
Judges 21:8 in English
Judges 21:8 · Berean Standard Bible
So they asked, “Which one of the tribes of Israel failed to come up before the LORD at Mizpah?” And, in fact, no one from Jabesh-gilead had come to the camp for the assembly.
Context
6Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya. 7Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?” 8Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa. 9Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa. 10Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.