Native Bible

Judges 21:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”

Judges 21:22 in English

Judges 21:22 · Berean Standard Bible

When their fathers or brothers come to us to complain, we will tell them, ‘Do us a favor by helping them, since we did not get wives for each of them in the war. Since you did not actually give them your daughters, you have no guilt.’”

Context

20Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, 21ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu. 22Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ” 23Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya. 24Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.