Native Bible

Judges 21:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,

Judges 21:20 in English

Judges 21:20 · Berean Standard Bible

So they commanded the Benjamites: “Go, hide in the vineyards

Context

18Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’ 19Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.” 20Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, 21ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu. 22Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.