Native Bible

Judges 21:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.

Judges 21:17 in English

Judges 21:17 · Berean Standard Bible

They added, “There must be heirs for the survivors of Benjamin, so that a tribe of Israel will not be wiped out.

Context

15Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu. 16Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala? 17Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ. 18Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’ 19Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.